Joel 1

1Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Juel nwa Petuel.

Mbibi nke igurube ga-eweta

2Nụrụnụ nke a, unu ndị okenye;
geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼala a.
Ihe dị otu a o meela na ndụ unu,
ka o mere na ndụ nna nna unu ha?
3Gwanụ ya ụmụ unu,
ka ụmụ unu gwakwa ụmụ ha, ka ụmụ ha gwakwa ụmụ ụmụ ha,
ka ụmụ ụmụ ha gwakwa ọgbọ nke na-eso ha.
4Ihe igurube rifọrọ
ka igurube ukwu richara,
ihe igurube ukwu rifọrọ,
ka ụmụ igurube richara,
ihe ụmụ igurube rifọrọ
ka igurube ndị ọzọ richapụrụ.

5Tetanụ, unu ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Kwaanụ akwa.
Kwaanụ akwa unu ndị na-aṅụ mmanya;
kwaanụ akwa nʼihi mmanya ọhụrụ,
nʼihi na e sitela nʼọnụ unu napụ unu mmanya unu na-aṅụ.
6O nwere mba bịakwasịrị ala m,
usuu ndị agha nke na-enweghị ịgụta ọnụ;
nke nwere eze dịka ọdụm,
nweekwa ikiri eze dịka ka nne ọdụm.
7Ọ laala mkpụrụ vaịnị m nʼiyi
mee ka osisi fiig m niile mebie kpamkpam.
O kpechapụsịala agbụgbọ osisi fiig m,
kpofuo ha,
hapụ alaka osisi ya ka ọ na-acha ọcha.

8Kwaa akwa mwute dịka nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,
nke di na-aga ịlụ ya nwụrụ.
9Akwụsịla iwebata onyinye ọka na onyinye mmanya
nʼụlọ Onyenwe anyị.
Ndị nchụaja na-eru ụjụ,
bụ ndị ahụ na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.
10Emebiela ala ubi niile,
ala nọ na-eru ụjụ.
Ebibiela ọka niile,
mmanya adịghịkwa,
otu a kwa, mmanụ oliv adịghịkwa.

11Daanụ mba nʼobi unu, unu ndị ọrụ ubi,
tienụ mkpu akwa, unu ndị ọrụ ubi vaịnị.
Tienụ aka nʼobi nʼihi ọka wiiti na ọka balị,
nʼihi na a laala owuwe ihe ubi nʼiyi.
12Osisi vaịnị anwụọla.
Osisi fiig akpọnwụọla.
Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla.
Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla.
Nʼebe ndị mmadụ nọ,
ọṅụ alala.

Ọkpụkpọ oku maka nchegharị

13Yikwasịnụ onwe unu akwa mkpe, unu ndị nchụaja; ruonụ ụjụ,
kwaanụ akwa, unu ndị na-eje ozi nʼebe ịchụ aja.
Bịanụ, yiri akwa mkpe nọ ọnọdụ abalị
unu ndị na-ejere Chineke m ozi
nʼihi na egbochiela onyinye ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ
ịbata nʼụlọ Chineke unu.
14Kpọsaanụ obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọọnụ nzukọta dị nsọ.
Chịkọtaanụ ndị okenye
na ndị niile bi nʼala a,
ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke unu;
ka ha tikuo Onyenwe anyị mkpu akwa.

15Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ bụ!
Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị abịala nso.
Ọ ga-ewetakwa mbibi site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.

16Ọ bụ na e sitebeghị nʼihu anyị
wezuga ihe oriri niile,
Ọ bụ na ọṅụ na obi ụtọ e sitebeghị
nʼụlọnsọ Chineke anyị pụọ?
17Mkpụrụ ubi
akpọnwụọla nʼọkpụrụkpụ aja ala.
Ụlọ a na-edebe ihe oriri atọgbọrọla nʼefu,
a kwatuola ọba niile,
nʼihi na mkpụrụ ọka niile akpọọla nku.
18Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume!
Igwe ehi na-awagharị
nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri;
ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.

19Gị Onyenwe anyị, ka m na-akpọku,
nʼihi na ọkụ erepịala ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ.
Ọkụ erechapụkwala osisi niile dị nʼọhịa.
20Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa,
nʼihi na iyi niile ataala,
ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.
Copyright information for IboBIU